Igbo Language Tutor Profile picture
Igbo Language Advocate/Tutor /Translator ENG - IGBO Translator IG:@igbo_language_tutor.
Mar 6, 2020 6 tweets 2 min read
Asụsụ Igbo maa mma jọọ njọ,ọ dịịrị ụmụafọ Igbo niile. Onye ọ bụla kwesịrị itinye aka mee asụsụ Igbo ka ọ mawaga mma karịa etu ọ dị ugbu a. O nweghị ihe asụsụ ndị àmà ama n'ụwa nwere, asụsụ Igbo enweghi😀.Ya bụ na onye Igbo ọbụla kwesịrị inwe afọ ojuju n'ebe asụsụ Igbo dị ma tinye aka kwado asụsụ Igbo nke ọma maka na a gbakọọ ọnụ nyuo maamiri, ọ gba ụfụfụ.