Igbo Ndị ọma nọ na Tuwita oge Akụkọ Ifo anyị eruwo. Igbo na asị na ezuo ka aha eri udene, atọ tuo ngiga.
#ỌgbakọNdịIgbo #Igbotic #IgboTwitterCommunity #IgboInvasion #Igbotic #IgboAmaka

THREAD

Kindly Read and Retweet so other Igbos can see this
AKUKO IFO
Akụkọ Ihe Mere Ụmụnwanyi ji Anaghị Agba Afụọnụ

Ifo Cha kpii !........................................... Woo!

O nwere otu ụbọchị...........................Otu ụbọchị eruo

Nkịta nyara akpa?................................ nsị agwụ n’ọhịa
N’OGE gboo, mgbe elu bụ ala ọsa, ma ụmụnwoke ma ụmụnwanyị na-agba afụọnụ.
  N’oge ahụ,o nwere otu agadi nwanyị aha ya bụ Mmaakụ. Nwanyị a wara anya ma na-akpa agwa ka nwoke. Afụọnụ ya buru ibu ma tokwaa ogologo.
Ndị obodo ha nwere oke mmemme ha na-eme afọ ọ bụla. Ya mere ka ha na-eme mmemme a, eze obodo ahụ pụtara gbaa egwu. Mgbe ọ gbachara egwu, o bidoro chọba ọla edo ọ na-agba n’aka achọ.  Ọla aka a e ji ọla edo wee mee nke eze na-agba n’aka bụ ebe amamihe ya nọ.
Nke a pụtara na eze agaghị achịlị obodo ma o jighị ọla a.Ewu na ọkụkọ malitere chọba ọla eze a n’ike n’ike ma a hụghị ya. Eze sokwa na-achọ. N’ihi nke a, e bute ikpe n’obi eze, ọ gaghị amakwa ihe ọ ga-ekpe.
Eze kwere onye ọ bụna ga-achọta ọla a nkwa ihe akụ akụ na ihe enwe enwe.

Otu ụbọchị, ka nwa odibo Mmaaku na-aga nkụ wee tụụta ọla, o maghị ihe ọ bụ o wee wegara nne ya ukwu. Nne ya ukwu matara na ọ bụ ọla eze ahụ a na-achọ achọ wee nara ya nwata ahụ zoo.
Ebumnuche ya bụ mgbe nwa ya nwoke tolitere ka o nye ya ka o were bụrụ eze. N’ihi anya ukwu ya,o gosịghị dị ya ọla ahụ.

Mgbe a chọkatara ọla a ma a hụghị ya, eze gara na nke dibịa afa ga gbaa afa. Dibịa gwara ya na ọla ahụ dị n’obodo ya, na mmadu zuuru ya.
Eze nyere ndị agha ya iwu ka ha ga chọba ọla ahụ n’ụlọ n’ụlọ. Mgbe a chọchara ma a hụghị, eze gaghachiri azụ ga gbakwa afa ọzọ.N’oge a, dibịa gwara ya ka o si n’ebe ụmụnwanyi nọ chọọ ya.
Ndị agha ya gara chọchaa a hụghị, ọ gaghachie azụ gbaa afa nke ugboro atọ, a gwa ya na o nwere nwanyi a chobeghi ya n’ụlọ ya.
Oge a, eze kpọrọ ndị agha ya jụọ ma o nwere nwanyi ha achọghị ọla ahụ na be ya, ndị agha ya gwara ya na ha achọghị ya na be Mmaaku n’ihi nsọpụrụ ha nwere ebe ọnọ, nke ọzọ wee bụrụ na ọ bụ ezigbo okenye na ha eleghi anya na ọ ga-ezu ohi.
Eze nyere ha iwu ka ha gaa n’ụlọ ya ozugbo ga chọọ ọla ahụ. Mgbe ha ruru n’ụlọ ya, ha kwaghachara ebe nile ma ha ahụghị ọla ahụ. Ha chọrọ ọla ahụ abali atọ na be ya ma ha ahụghị ya.
Mmaakụ bidoro mebe ọnụ. N’ihi nke, a ọ pụtara na mbara be ya na-agba egwu iji gosi na aka ya dị ọcha. Mgbe ọ na-agba egwu, ọla eze si na nnukwu afụọnụ ya dapụta bụ ebe o zoro ya. Nke a wee rie ndị mmadu ọnụ. Ike wee gwụ di ya.
Eze jiri iwe nye iwu ka Ezemmụọ obodo ahụ  kpụọ Mmaakụ afụọnụ. Mgbe e mechara nke a, o nyekwara iwu ka a kpụọ ụmụnwanyi nile afụọnụ.

Ezemmụọ were nsi mbe tee n’agba ụmụnwanyị nile ma kwubie okwu na ụmụnwanyi agaghizi na-agba afụọnụ.
Bido ụbọchị ahụ gawa, ụmụnwanyi anaghịzị agba afụọnụ, sọọsọ ụmụnwoke na-agba afụọnụ.

Ifo Cha kpii !........................................... Woo!

Ihe mmụta: Oke ọchịchọ adịghị mma.

©Chinwendu Uzoatu.
SHOULD I MAKE THIS FOLKTALE A WEEKLY ACTIVITY??
Missing some Tweet in this thread?
You can try to force a refresh.

Like this thread? Get email updates or save it to PDF!

Subscribe to 𝕸𝖆𝖟𝖎 𝕱𝖎𝖟𝖔
Profile picture

Get real-time email alerts when new unrolls are available from this author!

This content may be removed anytime!

Twitter may remove this content at anytime, convert it as a PDF, save and print for later use!

Try unrolling a thread yourself!

how to unroll video

1) Follow Thread Reader App on Twitter so you can easily mention us!

2) Go to a Twitter thread (series of Tweets by the same owner) and mention us with a keyword "unroll" @threadreaderapp unroll

You can practice here first or read more on our help page!

Follow Us on Twitter!

Did Thread Reader help you today?

Support us! We are indie developers!


This site is made by just three indie developers on a laptop doing marketing, support and development! Read more about the story.

Become a Premium Member ($3.00/month or $30.00/year) and get exclusive features!

Become Premium

Too expensive? Make a small donation by buying us coffee ($5) or help with server cost ($10)

Donate via Paypal Become our Patreon

Thank you for your support!